Välj språk här Välj språk här

Okala etiti akwuko

Okala etiti akwukwo

Ugboala na ebu oche ikpeazu puru. Onyebimbi nwokorobia kpu okpu bara na ime ulo ka omara na enwere ihe ahapuru, ma ohuru na onwenyi ihe echefuru na ulo mauli. O puru n’ihu ulo ma okpebiri na ogahi eche maka ihe mere ya n’ime ulo ahu ozo. Na otu aka anya ya gara n’akwukwo nke di n’akuku ekwenti. Ihe eji aka wede na edemede akwuko ahu dika ihe n’abuhi otu onye dere. Ufodu edemede ka ejiri nkpisi na ink wede ofuma, ndi ozo ka ede ka siri edeka. O bu ihe nine mere ya n’afo abuo gara aga, ihe ninendia, ka okpebiri ichefu, ka ede turu na akwukwo. Nke a bu ikawa ndu mmadu na okala etiti akwukwo.

Oweniri akwukwo ahu, nke bu mpe-mpe akwukwo mebiri eme bi, nke dikwa edo-edo n’amuke dika anyanwu. O debere ya na elu ihe we lee ya anya nkeoma. Na mbido akwukwo ahu bu aha nwanyi ”Alice” nke bu aha mara nma nke ukwu na uwa, bu aha onye ochoro ilu. Ihe na esota aha ahu bu onu ogu iri na ise ”15,11”. Odika onu abu edere na ihe edemede. Na okpuru ya ka edere ”ulo aku”. Obu ebe ulo olu ya di, na ime ulo olu ya ebe otukwasiri obi iji we na elekota ulo ya anya, na nwunye ya anya, na mbido ndu ya. Ma akachara nkpisi na okwu ulo aku. Nke gosiri na akwusiri ya n’olu. Mana ochotara ebe obidoro olu ozo nke na adiro nfe ichota.

Ihe nke ozo edere bu, ebe ana ele ”nkpuru osisi”, nke chetara ya na ogbara akwukwo mgbe onwere ego.
Ihe ozo edere bu ndi na enyere mmadu aka ikwapu, na ndi na edozi ulo. Chetara ya mgbe okwa batara n’ulo.
Ihe ozo edere bu ebe ana egosi ihe, no ”50,50” nke chetara ya mgbe ya na nwunye ya gara ebe ahu ile ihe ngosi. Ebe ahu bu ebe ana ano nwayo uche mmadu anatuhari. O bu ebe ahu ka anuli na ndu ha toro uto nke oma na enweghi nsogbu.
Nke ozo bu aha nwoke akabiri nke bu oyi ya nwoke. Nke bu nukwu onye na obodo. Mana omere ihe ojo, ojiri maka na obu nukwu mmadu nwe me ihe nke na adiro nma kpatara ojiri we da, site naya ka oji we rapu obodo.
Ihe ohu batara n’ime ndu di na nwunye. Ihe ozo edere di n’aka nwanyi onye na alu n’ulo ogwu. Nwanyi ulo ogwu ahu di obi ume ala. Oga fere ulo ebe ngbako, we garue n’ulo ebe ndina.
Edere na okpuru aha ya ”Dr L”.
Ugbua ka aha Mama putara nke bu nne nwunye ye ya. Mgbe eji cho ya. Ede kwasiri nukwu ihe ndi oso ga si na ihe nkpisi nme-nme. Nke gosiri ndi na elekota ulo lara ara na ndi ohu akpotara.
Ihe ndi ozo bu onye na ele ogwu na miri ala efi egotara, na ihe ndi oso ga si. Ihe ndi ozo nile ana eme n’ulo eji ekwenti eme ya, nke gosiri na nwanyi nwe ulo anoro ya. Ihe ndi ozo nile gbagwojuru ya anya dika nwoke nmiri na eri na acho ihu uzo na nmiri. Mana ihe ndi ozo foro bu na edere onye na ebu ozu, na akpati ozu n’aja naru aja.
Aja naru aja bu ihe ikpeazu edere. Na akwukwo ahu. Nke gosiri ihe mere na ndu.

O nwere akwukwo ahu susu ya onu tinye ya n’akpa ya. Na ime nkeji abua obiri ndu ya ozo n’afo abua.

O buturo isi ya ani mgbe ochoro ipu na ulo, obuniri isi ya elu dika nwoke nwere onwu na ngala. Maka na omara ihe n’ile di nma na uwa biara ya. O mere ebere ndi mmadu n’ile ihe ndi oma emere o.

Översatt av Michael Chike Asiegbu